James 1:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe ọ bụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahihia kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nꞌala, ka mma ya gwụsịakwa.
Igbo 2006
N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.