James 1:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
Igbo 2006
Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.