James 1:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nꞌime iwu ahụ zuru oke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya ee, nwoke ahụ na-aga nꞌihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka Chineke ga-agọzi mgbe ọ na-aga nꞌihu na-eme ihe ahụ.
Igbo 2006
Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.