James 1:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa.
Igbo 2006
Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.