James 2:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
ma ị sị enyi gị ahụ, “Laa nꞌudo nwanna m, Chineke gọzie gị. Ya nyekwa gị uwe ị ga-eji chụọ oyi, na nri ị ga-eji zụọ afọ gị,” ma ọ dịghị ihe ọ bụla i mere iji nyere ya aka igbo mkpa agụụ na-agụ ya na oyi na-atụ ya, ọ̀ dị ụzọ okwu ọma nile i kwuru siri nyere ya aka?
Igbo 2006
ma otù onye n'etiti unu si ha, Labanu n'udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyeghi ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara?