James 2:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mmadụ pụrụ ịgwa m sị, “I nwere okwukwe ma e nwere m ọrụ ọma.” Ma ihe m ga-asa onye ahụ bụ nke a, “Zi m otu i siri nwee okwukwe nꞌime Chineke mgbe ị na-arụghị ọrụ ọma ọ bụla iji gosi ya, ma mụ onwe m ga-egosikwa gị na m bụ onye nwere okwukwe nꞌime Chineke site nꞌọrụ ọma m naarụ.”
Igbo 2006
Ma otù onye gāsi, Gi onwe-gi nwere okwukwe, mu onwem nwe-kwa-ra ọlu: gosim okwukwe-gi ma ọlu-gi adighi ya, mu onwem gēsite kwa n'ọlum gosi gi okwukwem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ