James 2:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Leenụ Eberaham nna anyị ochie, gịnị mere Chineke jiri gụọ ya nꞌonye ezi omume? Ọ̀ bụghị nꞌihi ihe o mere? Ọ̀ bụghị nꞌihi na o duuru Aizik chọọ iji ya chụọra Chineke aja?
Igbo 2006
Èsiteghi n'ọlu gu Abraham nna-ayi n'onye ezi omume, mb͕e ọ churu Aisak nwa-ya nwoke n'elu ebe-ichu-àjà?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja?