James 2:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ anya sị ya, “Bịa nọdụ nꞌotu oche e debere iche nꞌihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, i nwere ike iguzo nꞌebe ahụ,” ma ọ bụ “Bịa nọdụ ala nꞌebe a ụkwụ m dị,”
Igbo 2006
ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,”