James 2:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ̀ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dị ka ndị ogbenye mee ha ka ha bụrụ ọgaranya site nꞌokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ Chineke kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nꞌanya?
Igbo 2006
Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya?