James 2:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ̀ bụghị ndị ọgaranya na-apụnarị unu ihe unu nwere? Ọ̀ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nꞌụlọ ikpe? Ọ̀ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma nke Onyenwe anyị?
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe?