James 4:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nꞌihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, ma ọ bụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu Chineke. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe.
Igbo 2006
Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.