James 4:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ nanị otu onye dị nke na-enye ndị mmadụ iwu. Ọ bụkwa nanị otu onye ikpe dị, Chineke nꞌonwe ya. Ọ bụ nanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọ bụla nꞌiyi. Ma gị, nwanna m, ònye ka ị na-eche na ị bụ i ji na-ekpe nwanna gị ikpe?
Igbo 2006
Nání otù Onye bu onye nēnye iwu, buru kwa onye-ikpé, bú Onye ahu Nke puru izọputa na ila ihe n'iyì: ma gì onwe-gi bu onye, gi onye nēkpe onye-ab͕ata-obi-gi ikpé?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?