James 4:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a.
Igbo 2006
Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.