James 5:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụmụnna m, ùnu chọrọ ihe ga-abụrụ unu ihe ilere anya banyere otu ndị Chineke si anagide ahụhụ? Mgbe ahụ mụtanụ ihe site na ndụ ndị amụma kwuru okwu nꞌaha Chineke, na ahụhụ nke ha hụrụ.
Igbo 2006
Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị.