James 5:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị na-agụ ha ugbu a dị ka ndị a gọziri agọzi nꞌihi na ha diri ahụhụ. Unu anụla akụkọ Job, otu o siri hụọ ahụhụ na otu Chineke siri gọzie ya nꞌikpeazụ. Chineke bụ onye jupụtara nꞌobi ebere na ọmiko.
Igbo 2006
Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.