Jeremiah 1:16 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēkwu kwa okwu ikpem nile n'ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n'ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.