Jeremiah 1:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.