Jeremiah 10:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”