Jeremiah 10:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.