Jeremiah 11:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’