Jeremiah 13:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche.