Jeremiah 15:20 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ. Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo. Ha ga-ebuso gị agha, ma ha agaghị emeri gị nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị, nakwa ịzọpụta gị,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.