Jeremiah 17:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ejiwo pen ígwè, ji kwa ọnu-ọnu diamond, de nmehie Juda: atuwo ya n'elu mbadamba nkume, bú obi-ha, na n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nile nke umu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.