Jeremiah 17:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n'ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,