Jeremiah 2:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n'ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n'ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya.