Jeremiah 23:36 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ibu Jehova ka unu nāgaghi-ehota kwa ọzọ: n'ihi na ibu eboro onye ọ bula bu okwu nke aka ya; unu ab͕anwewo kwa okwu nile nke Chineke di ndu, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.