Jeremiah 25:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na, le, ọ bu n'obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n'ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n'uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’