Jeremiah 26:13 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.