Jeremiah 27:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a Mu onwem enyewo ala nile ndia n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, bú orùm; ọzọ kwa, anu ọhia ka M'nyeworo ya ifè ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu.