Jeremiah 27:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.