Jeremiah 3:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Je, kpọsa okwu ndia n'uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gaghi-edo unu iru iwe: n'ihi na onye-ebere ka M'bu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.