Jeremiah 3:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.