Jeremiah 3:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ka ayi dina ala n'ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n'olu Jehova, bú Chineke-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”