Jeremiah 30:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gāb͕ajipu yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibì; ndi ala ọzọ agaghi-eme kwa ka ọ fè ha òfùfè ọzọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.