Jeremiah 31:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.