Jeremiah 31:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.