Jeremiah 31:33 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gētiye iwum n'ime-ha, ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ya dika n'akwukwọ; M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.