Jeremiah 32:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.