Jeremiah 32:44 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A ga-ejikwa ọlaọcha zụọ ala ubi, deekwa ihe banyere orire na ọzụzụ ya nʼakwụkwọ. A ga-aka akwụkwọ ndị ahụ akara nʼihu ndị akaebe, nʼala Benjamin, na nʼobodo nta niile dị gburugburu Jerusalem, ma nʼala Juda, na nʼobodo dị nʼala ugwu ugwu, na nke dị na mgbada ugwu niile dị nʼọdịda anyanwụ, na nke dị na Negev, nʼihi na aga m esite nʼobodo ndị ahụ dọtara ha nʼagha buuru ha gaa kpọlata ha. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”