Jeremiah 32:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị.