Jeremiah 33:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N'ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n'obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.