Jeremiah 33:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.