Jeremiah 33:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘ Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.