Jeremiah 33:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēme kwa ka ha si n'ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M'gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n'ime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.