Jeremiah 34:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n'anyam abua, n'ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n'aka-gi; unu we b͕a ndu n'irum n'ulo nke akpọkwasiri aham:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.