Jeremiah 34:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”