Jeremiah 36:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n'ọnu Jeremaia n'elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n'ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n'elu ha ọtutu okwu dika ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.