Jeremiah 37:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n'Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n'agha we nuru akukọ-ha, ha we si n'imegide Jerusalem rigo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.