Jeremiah 38:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n'ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n'udo akpaliwo gi, we nwe ike n'aru gi: ukwu-gi abua emiwo n'apiti, ha we laghachi azu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’