Jeremiah 38:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma mb͕e ndi-isi gānu na mu na gi ekwuwo okwu, ha we biakute gi, si gi, Biko, gosi ayi ihe i gwaworo eze; ezonarila ayi ya, ayi agaghi-eme kwa ka i nwua: gosi kwa ayi ihe eze gwara gi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’